NURU EKPERE ANYI by Stanley Anih — Lyrics

Stanley Anih Igbo Hymns Prayer Prayer of the Faithful (POF) Anthems Staff & Solfa notation

Full Lyrics

TENOR SOLO Chukwu anyị abịawo e, anyị abịawo kwa e Olisa bin'igwe ọkwa Gị bụ ike anyịo Olisa bin'igwe ọkwa Gị bụ mgbọrọgwụ anyịo SOPRANO Olisa doh biko, doh TENOR SOLO Doh biko nụrụ ekpere anyị Olisa doh biko nụrụ ekpere anyịo Olisa bin'igwe biko nụr'ayịyọ anyịo Ana nụr'ọnụ anyịo, enu nụr'ọnụ anyịo ewo. Ya dịkwara nwoke mma, dịkwara nwanyị mma Olisa doh, Olisa doh Egbe beluo, ugo belu e K'anyị n'ayọ Olisa doh biko nụrụ ekpere anyịo Olisa doh biko nụr'ayịyọ anyịo. SOPRANO Akw'a nyịo, Olisa biko, Olisa biko TENOR SOLO Ogonogo ndụ, ogonogo ndụ n'ahụ isike k'anyị n'ayọ, Makana ndụ bụ isi, ndụ bụ isi na ndụ bụ isi e Chukwu e Onyenweanyị e nụr'ekpere anyịo Mh SOPRANO Biko nụrụ, Olisa biko, Olisa biko TENOR SOLO Chetakwa oh Chukwu n'anyị adịgh'ike, Anyị ewegh'ike onwe anyị mana Gị oh Chukwu bụ ike anyị n'ayọ Gị Olisa bin'igwe nyenu anyị udo Makana udo na ịdị n'otu na ewe t'agam n'iru; Olisa Bikozie, Olisa doh nụr'ekpere anyịo ịhọma E ihe dimma e rụtụnu anyị aka ịhọma E ihe dimma e rụtụnu anyị aka ịhọma E ihe dimma e rụtụnu anyị aka SOPRANO Doh nụrụ ekpere anyịo Olisa doh nụrụ ekpere anyịo, Ma gọzie anyịo, biko gọzie anyịo Ise.

Download the sheet music

NURU EKPERE ANYI

NURU EKPERE ANYI

By Stanley Anih
Staff & Solfa
Igbo
24 pages
0 Downloads
Hymns Prayer Prayer of the Faithful (POF) Anthems
0 0

More lyrics you may want