Full Lyrics
TENOR SOLO
Chukwu anyị abịawo e, anyị abịawo kwa e
Olisa bin'igwe ọkwa Gị bụ ike anyịo
Olisa bin'igwe ọkwa Gị bụ mgbọrọgwụ anyịo
SOPRANO
Olisa doh biko, doh
TENOR SOLO
Doh biko nụrụ ekpere anyị
Olisa doh biko nụrụ ekpere anyịo
Olisa bin'igwe biko nụr'ayịyọ anyịo
Ana nụr'ọnụ anyịo, enu nụr'ọnụ anyịo ewo.
Ya dịkwara nwoke mma, dịkwara nwanyị mma
Olisa doh, Olisa doh
Egbe beluo, ugo belu e
K'anyị n'ayọ Olisa doh biko nụrụ ekpere anyịo
Olisa doh biko nụr'ayịyọ anyịo.
SOPRANO
Akw'a nyịo, Olisa biko, Olisa biko
TENOR SOLO
Ogonogo ndụ, ogonogo ndụ n'ahụ isike k'anyị n'ayọ,
Makana ndụ bụ isi, ndụ bụ isi na ndụ bụ isi e
Chukwu e Onyenweanyị e nụr'ekpere anyịo Mh
SOPRANO
Biko nụrụ, Olisa biko, Olisa biko
TENOR SOLO
Chetakwa oh Chukwu n'anyị adịgh'ike,
Anyị ewegh'ike onwe anyị mana Gị oh Chukwu bụ ike anyị n'ayọ Gị
Olisa bin'igwe nyenu anyị udo
Makana udo na ịdị n'otu na ewe t'agam n'iru; Olisa
Bikozie, Olisa doh nụr'ekpere anyịo ịhọma
E ihe dimma e rụtụnu anyị aka ịhọma
E ihe dimma e rụtụnu anyị aka ịhọma
E ihe dimma e rụtụnu anyị aka
SOPRANO
Doh nụrụ ekpere anyịo
Olisa doh nụrụ ekpere anyịo,
Ma gọzie anyịo, biko gọzie anyịo
Ise.