Full Lyrics
CHORUS
Ñụrịbanụ, k'anyị goribenụ,
Ñụrịbanụo, na Kristi Dinwenu,
Eze amụrụ ọhụrụ,
Onyenzọpụta ụwa nile abịawo.
VERSE 1
Ụwa nile tibenu mkpụọñụ,
Kweben' ukw' otito,
N'ihi n'ụwa enwewo Onyenzọpụta.
VERSE 2
N'ụlọ anụ na Bethlehem
Ka amụrụ Jesu, Ez'ụwa nile
Ngozi pụr'iche adịgaro
Virgin Maria bụ Nne Onyenzọpụta.
VERSE 3
Ndi eze itọ siri n'ọwụw' anyanwụ
Jeeb' amụrụ Ya,
Ha nyere onyinye Ọlaedo,
Frankincence na myrrh,
Onyinye an'enye ndi eze.
VERSE 4
K'anyị soronu ndị mmụọ
Ma nye Chineke kele,
Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu.