Full Lyrics
REFRAIN
Ngwanụ k'anyị jeenụ nara Kristi n'oriri nsọ
K'anyị jeenụ nara Kristi n'oriri nsọ
K'anyị jee n'altar Dinwenụ n'oriri nsọ
K'anyị jee n'altar nke Chineke
Nri ọma si n'igwe
K'anyị g'eri n'oriri ndụ
Nri ọma si n'igwe
K'anyị g'eri n'oriri ndụ
Nri ndị mmụọ ozi akwadebeere
Ọ nara ya
K'anyị g'eri Ya k'anyị g'eri
Bịanụ k'anyị jeenụ
Bịanụ k'anyị jeenụ
Bịanụ k'anyị jeenụ
Bịanụ k'anyị jeenụ
N'altar nke Chineke
Ahụ Dinwenụ n'enye ndụ n'ezie
N'altar nke Chukwu
Bịa mara ya!
Ndị dị mma n'obi bịa n'altar nke Chineke
Ndị dị mma n'obi bịa n'altar nke Chineke
Bịakene k'anyị jeenụ n'altar nke Chukwu
Ndị obere bịa n'altar nke Chukwu
n'oriri nsọ.
VERSE 1
Ngwanụ k'anyị jeenụ sọpụrụ
Onye nwe anyị n'ebe ọnwụ n'ọnwụ neluo
K'anyị jeenụ sekpuere
Onye Chukwu ja meluo
Ngwanụ k'anyị jeenụ kpọọrọ Ya isiala
nọziere Ya
Ngwanụ k'anyị jeenụ nara Jesu nọ n'oriri nsọ.
VERSE 2
Ọ bụ onye g'akọwara m Ihe omimi?
Sacrament nke Eucharistia
Ọ bụ ihe omimi n'anya anyị
Ọ bụ onye g'akọwa Ya?
Ihe omimi Sacrament nke Eucharistia
Ọ bụ ihe omimi d'ịtụnanya!
Ọ bụ onye g'akọwa Ya?
Ihe omimi na Chukwu were onwe Ya nye
Sacrament nke Eucharistia
Ọ bụ ihe omimi maka mụ na gị
nwụ ọnwụ n'elu obe
maka njọ mụ na gị
d'ịtụnanya!
Ọ bụ onye g'akọwa Ya?
Ihe omimi were nye anyị
Sị anyị rie
Sacrament nke Eucharistia
Ọ bụ ihe omimi
Sị anyị nụ
Achịcha na mmanya.