Full Lyrics
REFRAIN
Nri ndị mmụọma, nri n'enye ndụ
Nke Kristi nyere anyị tupu ọnwụọ n'elu obe
Ọ mebenu ya ma ncheta nke m o
Mebenu ya k'unu nwe ndụ ebi ebi
Bịa nụ nwanne m lee, ijegokwe?
Ịnarago? Irigokwe? Ahụ Kristi
Ijegokwe? Ịnarago? Ọ n'enye ndụ ebi ebi
VERSE 1
Lee nụ Kristi n'ụdị ọcha n'ama mma
Nri a, chịcha n'enye ndụ
Onye dị ọcha bilie nara ndụ ebi ebi
Ọ mer'onwe ya, onye dị ọcha bilie nara ndụ ebi ebi
VERSE 2
Lee nụ nwatụrụ, nwatụrụ nke Chineke
Onye n'ekpochapụ njọ n'ụwa niile
Ha nwere isi ọma bụ ndị a
Onye dị ọcha bilie nara ndụ ebi ebi
Onye dị ọcha bilie nara ndụ ebi ebi
VERSE 3
O Dinwenu m, etosirọ m k'ị bata n'obi m
Kwuo nụ s'of'okwu n'obi m gaadịrị mma
O Yukaristia, nri ndị mmụọma n'enye ndụ
Nke n'ebelata agụụ ori warawara nke njọ
Nke n'ebelata agụụ ori warawara nke njọ