Full Lyrics
CHORUS
N'oriri Ikpeazụ Jesu rịọrọ Nna ya
Ka nzukọ Ya bụrụ otu n'ụwa
Anyị n'arịọ Gị
N'oriri nke taata k'anyị niile soro n'ime Chukwu
K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ.
VERSE 1
Maka nzukọ k'anyị niile n'arịọ Gị
Ka ndị otu Christi ju n'ihunanya
Ka obi mmadụ n'ụwa niile bụrụ otu
Kpọkọba mmadụ ncha n'akakụ Gị
K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ.
VERSE 2
Anyị n'arịọ maka ndị ọrụ Chukwu
K'ọ kpọchigha ha n'otu igwe atụrụ
Ka ha wee nọrọ n'okpuru otu onyeisi
Na nzukọ nke jikọrọ mmadụ ncha
K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ.
VERSE 3
Oge gaeru mgbe Sacrament gaagwụ
O Jesu kpọba anyị n'eluigwe
K'anyị soro ndị Mmụọma na ndị niile dị nsọ
Hụ Gị anya n'añụrị na ndokwa
K'anyị binye n'ebebe ito n'ime otu dị ngọzi.