N'oriri Ikpeazu [Tune II] by Very Rev. Fr. G. Ezenduka — Lyrics

Very Rev. Fr. G. Ezenduka Igbo Communion Hymns Benediction & Adoration Hymns Holy Week Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS N'oriri Ikpeazụ Jesu rịọrọ Nna ya Ka nzukọ Ya bụrụ otu n'ụwa Anyị n'arịọ Gị N'oriri nke taata k'anyị niile soro n'ime Chukwu K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ. VERSE 1 Maka nzukọ k'anyị niile n'arịọ Gị Ka ndị otu Christi ju n'ihunanya Ka obi mmadụ n'ụwa niile bụrụ otu Kpọkọba mmadụ ncha n'akakụ Gị K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ. VERSE 2 Anyị n'arịọ maka ndị ọrụ Chukwu K'ọ kpọchigha ha n'otu igwe atụrụ Ka ha wee nọrọ n'okpuru otu onyeisi Na nzukọ nke jikọrọ mmadụ ncha K'anyị ncha bụrụ otu ahụ n'ime Sacrament dị asọ. VERSE 3 Oge gaeru mgbe Sacrament gaagwụ O Jesu kpọba anyị n'eluigwe K'anyị soro ndị Mmụọma na ndị niile dị nsọ Hụ Gị anya n'añụrị na ndokwa K'anyị binye n'ebebe ito n'ime otu dị ngọzi.

Download the sheet music

N'oriri Ikpeazu [Tune II]

N'oriri Ikpeazu [Tune II]

By Very Rev. Fr. G. Ezend...
Solfa
Igbo
1 page
2 Downloads
Communion Hymns Benediction & Adoration Hymns Holy Week Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want