N' Oriri Ikpeazu (Pilgrim) by Henry Thomas Smart — Lyrics

Henry Thomas Smart Igbo Communion Hymns Holy Week Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 N'oriri ikpeazụ Jesu rịọrọ Nna Ya Ka nzụkọ Ya bụrụ otu n'el'ụwa Anyị n'arịọ Gị n'oriri nke tata K'anyị nile sọrọ n'ịrịọ Chukwu K'anyị ncha bụrụ Otu ahụ N'ime Sacramenti di asọ. VERSE 2 Maka nzụkọ k'anyị nile n'arịọ Gị Ka ndị otu Christi ju n'ịhụnanya K'obi mmadụ n'ụwa nile bụrụ otu Kpọkọba mmadụ ncha n'ụkwụ Gị K'anyị ncha bụrụ Otu ahụ N'ime Sacramenti di asọ. VERSE 3 Anyị n'arịọ maka ndị otu Christi K'ị kpọchịghaa ha n'otu ìgwè atụrụ Ka ha wee nọrọ n'okpuru otu onye isi Na nzụkọ nke jikọrọ mmadụ ncha K'anyị ncha bụrụ Otu ahụ N'ime Sacramenti di asọ. VERSE 4 Oge n'eru mgbe Sacrament g'agwụ O Jesu kpọbat'anyị n'eligwe K'anyị sọrọ ndị Mmụọma na ndị di nsọ Hụ Gị n'anya n'aṅụrị na ndo ụwa K'anyị binyere ebe ahụ Ịtọ n'ime otu di ngọzi.

Download the sheet music

N' Oriri Ikpeazu (Pilgrim)

N' Oriri Ikpeazu (Pilgrim)

By Henry Thomas Smart
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Communion Hymns Holy Week Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want