Full Lyrics
CHORUS
Oge n'akuwala o aha!
Maka na nne dị mma aha
Ekwo akuwala o aha!
Maka na nne dị mma aha!
Nne dị mma n'ezie
Nne amaka
Nne dị ụtọ aha!
Nne amaka n'ezie eh?
VERSE 1
Gịnị kacha mma nwanne m n'elu ụwa
Nne, nne bụ onyinye pụrụ iche Chineke nyer'anyị
Nne, nne bụ onyinye dị mma chi anyị nyer'anyị eh!
VERSE 2
Gee ntị onye jọrọ nne ya gwụ egwu
Kpa nganga nne dị ụtọ a naghị azụ nne n'ahịa
Ony'ọ bụla lekọta nne ya biko doo
VERSE 3
Ndị nne
Olee onye mụrụ ha nne ndị nne
Ọ bụ onye
Ụmụ agbọghọbịa
Ụmụ okorobịa
Ndị okenye
Ndị nze
Professor
Ndị Doctor
Ndị n'achị achị
Ndị echiri echi
Ndị n'azụ ahịa
Ndị n'alụ ọlụ