Full Lyrics
[REFRAIN]
Nne bụ ihe mara mma n'ụwa, ihe mara mma n'ụwa
Nne bụ onyinye mara mma Chineke nyere anyị
Onyinye pụrụ iche n'elu ụwa, Chukwu nyere anyị
Bụ ngọzi Chineke
Onye ọbụla nwere nne n'elu ụwa ya nụrịba na nne amaka.
[VERSE 1]
Onye nwere nne e, onye nwere nne e
Jina ya eti epele makana ihe nne gabigara maka gị karịrị a
Jina ya eti epele, ị naanụ?
Ihe nne gabigara maka gị karịrị a
Karị akparịkwana ya, ị naanụ?
Akparịkwala akparịa
Ya chọba ife d'g'eme n'elu ụwa k'obi dị me gị mma me
Onye buru gị n'afọ ọnwa itenani, ọkwa nne?
Onye diri ihe ụfụ mụputa gị, ọkwa nne?
Onye neledo gị anya ka ị ghara imerụ ahụ, ọkwa nne?
Onye gụgụrụ gị akwa oge ị n'ebe akwa, ọkwa nne?
Onye mụrụ anya abalị ka i were rahụ ụra, ọkwa nne?
Ọkwa nne me o, ọkwa nne, ọkwa nne
N'arịọ Chineke oge ị nọ n'ọrịa ka ị dịrị ndụ.
[VERSE 2]
Chukwu goziere m mama
Chukwu goziere mu mama
Chukwu gozie mama m o
Ezigbo nne i jiri wee gozie m o
Biko Nna doo chebe ya
Ana m arịọ ezi Nna doo
Nye nnem ọganihu
Nyekwa y'ogologo ndụ n'ahụ isike
Nke a bụ ekpere m o ezi Chineke
Nụrụ olu m o biko.