NNE AMAKA by Emma Orji — Lyrics

Emma Orji Igbo Mothers song Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Nne bụ ihe mara mma n'ụwa, ihe mara mma n'ụwa Nne bụ onyinye mara mma Chineke nyere anyị Onyinye pụrụ iche n'elu ụwa, Chukwu nyere anyị Bụ ngọzi Chineke Onye ọbụla nwere nne n'elu ụwa ya nụrịba na nne amaka. [VERSE 1] Onye nwere nne e, onye nwere nne e Jina ya eti epele makana ihe nne gabigara maka gị karịrị a Jina ya eti epele, ị naanụ? Ihe nne gabigara maka gị karịrị a Karị akparịkwana ya, ị naanụ? Akparịkwala akparịa Ya chọba ife d'g'eme n'elu ụwa k'obi dị me gị mma me Onye buru gị n'afọ ọnwa itenani, ọkwa nne? Onye diri ihe ụfụ mụputa gị, ọkwa nne? Onye neledo gị anya ka ị ghara imerụ ahụ, ọkwa nne? Onye gụgụrụ gị akwa oge ị n'ebe akwa, ọkwa nne? Onye mụrụ anya abalị ka i were rahụ ụra, ọkwa nne? Ọkwa nne me o, ọkwa nne, ọkwa nne N'arịọ Chineke oge ị nọ n'ọrịa ka ị dịrị ndụ. [VERSE 2] Chukwu goziere m mama Chukwu goziere mu mama Chukwu gozie mama m o Ezigbo nne i jiri wee gozie m o Biko Nna doo chebe ya Ana m arịọ ezi Nna doo Nye nnem ọganihu Nyekwa y'ogologo ndụ n'ahụ isike Nke a bụ ekpere m o ezi Chineke Nụrụ olu m o biko.

Download the sheet music

NNE AMAKA

NNE AMAKA

By Emma Orji
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Mothers song Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want