Full Lyrics
VERSE 1
Njinji jiri na Galilee, nwanne m, na Kristi anyị ekuligo.
Ọnwụ ọnwụ, nto! Jesu emerigo, ka ụwa nile nwebe añụrị.
N'obe Calvary ka akpọgburu Jesu Eze ụwa ni.
Lee Jesu emerigo, obiligo,
Gọsị anyị na m bilite n'ọnwụ di Jesu muo,
Otito dịrị gị.
VERSE 2
Bịa bịa k'anyị gaa nụ na Galilee,
Ebenebe egbuego, njinji ejigo.
Ụwa nile kpọtụba kpọtụba,
Mebe añụrị makana Jesu emerigoo ọnwụ.
VERSE 3
Ụwa nile mebe añụrị ọñụ.
TREBLE SOLO
Butenụ ekwe, butenụ ogwe,
Butenụ ịdụ, butenụ ube,
Na mkpọtọm kpọ na ọyọ.
CHORUS
Bukuonụ ya abụ ọma,
Bukuonụ ya abụ ọma,
Bukuonụ ya abụ ọma,
Bukuonụ ya abụ ọma.
Bukuonụ ya abụ ọma, wa añụrị ba,
Ụmụ ụwa nwebe añụrị.
Kwebenụ Alleluia.
Oh abụ ọma, bukuonụ ya abụ ọma.
Alleluia, Jesu emerigo, Kristi ekuligo,
Bịenụ ọrọ, bịenụ ọrọ.
Ụwa ñụrịba na Kristi ekuligo,
Bukuonụ ya na Kristi ekuligo.