NGOZI (Igbo-Nigeria) by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Ikuku nnyere m o ezi Chineke ikuku ndụ m o Ngozi ngozi o! Ọ bụrụ na m gaakwụ ụgwọ ya Chineke Ọ bụ onye ka m gaebite n'ụọ? Ngozi o! Onyinye dị ukwu ka m g'ebunye Chineke Onye ngwa ngwa k'anyị jee jee k'anyị jee kele ya m'ude yi jiri ngozi ya saa m ahụ tee m ude yi b'e m kuwe! Ngozi eh! Chineke juru m o mana ahụ m bụzi ngozi ngozi Ngozi Chineke nụ bja nụ Lee Ngozi Chineke nụ Ọ zuru m ahụ Ngozi Chineke VERSE 2 Mmiri ozuzo Chukwu nyer'anyị Ngozi ngozi o! eh! mana Chineke jigide m mmiri si n'igwe ụwa gaagba akụọ Ngozi ngozi o! VERSE 3 Ọnwa na anyanwụ netiri igwe ha na kpakpando bụ ngozi maka na ọnwa n'enyi ihe, anyanwụ n'enyi ihe kpakpando n'amụke! Ngozi ngozi o! VERSE 4 Chi ojiji anyị jị ezu ike n'elu ụwa ọ bụkwa ngozi Chukwu o! Ọ bụrụ na chi ejighị ejinyụ bọọ chi o mmadụ gaarụgbukwa onwe ya n'ọrụ o! Ngozi ngozi o! VERSE 5 Onyinye bara ụba Onyinye nwa, onyinye akụ n'ihe onwunwe Ngozi eh! Ngozi! Chineke m o gbara m gburugburu nọrọ be m o kirikiri o Ngozi ngozi o!

Download the sheet music

NGOZI (Igbo-Nigeria)

NGOZI (Igbo-Nigeria)

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
20 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want