The New Igbo Gloria (Otito Diri Chineke) by Fr. Onyekwelu Val, C.S.Sp — Lyrics

Fr. Onyekwelu Val, C.S.Sp Igbo Gloria Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ọtịtọ dịrị Chineke n'elu kacha elu, n'elu kacha elu ọtịtọ eh. N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma. VERSE 1 Anyị ajaa Gị mma, anyị agọzie Gị eh, anyị asekpu oro Gị, anyị atoo Gị eh, anyị a kelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị eh. Oseburụwa Chukwu, Eze nke Eligwe, Chukwu Nna p'ike nile. VERSE 2 Jesu Kristi, sọ Otu Nwa Chineke mụrụ, Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna. Gị Onye n'ekpochapụ njọ, njọ nk'ụwa, meere anyị ebere, ebere. Gị Onye n'ekpochapụ njọ, njọ nk'ụwa, nụrụ arịrịọ anyị, Nna doo. Gị Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere, ebere. VERSE 3 N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenu, sọ Gị Jesu Kristi, kachasị dị elu. Gị na Mmụọ Nsọ, n'ebube Chukwu Nna. Amen, Amen.

Download the sheet music

The New Igbo Gloria (Otito Diri Chineke)

The New Igbo Gloria (Otito Diri Chineke)

By Fr. Onyekwelu Val, C.S...
Solfa
Igbo
2 pages
5 Downloads
Gloria Hymns
0 0

More lyrics you may want