Full Lyrics
CHORUS
Ọtịtọ dịrị Chineke n'elu kacha elu,
n'elu kacha elu ọtịtọ eh.
N'ụwa udo dịrị ndị mmadụ
ndị nwere obi ọma.
VERSE 1
Anyị ajaa Gị mma, anyị agọzie Gị eh,
anyị asekpu oro Gị, anyị atoo Gị eh,
anyị a kelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị eh.
Oseburụwa Chukwu, Eze nke Eligwe,
Chukwu Nna p'ike nile.
VERSE 2
Jesu Kristi, sọ Otu Nwa Chineke mụrụ,
Dinwenu Chukwu, Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna.
Gị Onye n'ekpochapụ njọ, njọ nk'ụwa,
meere anyị ebere, ebere.
Gị Onye n'ekpochapụ njọ, njọ nk'ụwa,
nụrụ arịrịọ anyị, Nna doo.
Gị Onye nọ n'aka nri Nna,
meere anyị ebere, ebere.
VERSE 3
N'ihi na sọ Gị dị Nsọ,
sọ Gị bụ Dinwenu,
sọ Gị Jesu Kristi,
kachasị dị elu.
Gị na Mmụọ Nsọ,
n'ebube Chukwu Nna.
Amen, Amen.