Full Lyrics
Oge onyinye erugo, oge anyị ji atụrụ Chukwu mma mma,
wee nara amara Ya, wee nara ngozi Ya.
Ọ bụ gịnị g'egbochiri m ikele Chineke maka ngozi nile Ọ jiri nọrube mo,
gbaa m okirikiri?
Mkpụrụobi m, golibe na Chineke, golibe.
Ụmụ ụwa, kilibe afọma Chukwu n'arụ mo.
O hichara m anya mmiri! Mkpụrụobi m n'egori na Chukwu mo!
Akwa nile m n'ebe, Chineke hichara m anya.
Kilibe afọma Chukwu n'arụ mo.
Naranụ onyinye mo, Chineke, gọzienụ ya.
Naranụ onyinye, Onye ker'ụwa, gọzienụ mo.
Ọ nweghị ihe m nwere, ezi Chineke karị onyinye si n'obi mo!
Naranụ ya, dika nke Abel.
Onyinye buru ibu, onyinye dị ọcha, onyinye dị mma,
bụ onyinye na asọ Chukwu.
Onyinye buru ibu, dịkwa ọcha dị mma, ọ bụ ya ka m jiri bịa.
Naranụ ya gọzie Chineke, n'aka nwodibo Gị.
Ị gọziri m Chineke, nye m ụmụ, nyekwa m akụ n'ụba.
Aga m agọzi aha Gị, tuoro Gị mma mma.
Ngozi Gị barụba Chineke, amara Gị juru anya!
Kilibe afọma Chukwu o! Golibenu na Chukwu o!