NARANU M RIE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ụmụ Chineke naranụ m rie dị Nsọ Rienụ nri ọma, ṅụa Ọbara Dinwenu Nri n'enye ndụ, naranụ m rie Nri dị Nsọ, nri n'enye ndụ, nri ndị Mmụọ Naranụ m rie, nri si n'igwe gbadata Naranụ m rie, Ọ bụ Kristi n'akpọ gị Nri ọma, bịa Ọbara nke Dinwenu, nwannem bịa Naranụ m rie Kristi n'akpọ gị Nwannem bịa, nri ọma, nri n'enye ndụ Naranụ m rie nke Dinwenu Naranụ m rie nke a buarụ nri dị Nsọ Naranụ m rie, nri ọma Naranụ m rie Ọbara nke Dinwenu, nwannem bịa Naranụ m rie, nri si n'igwe gbadata Nri ọma k'ọ ngọzi, Ọbara nke Dinwenu VERSE 1 Chukwu Nwa si n'eligwe bịa n'ụwa Jesu Chukwu Nwa si n'igwe bịa d'ịtaa ahụhụ Rata odibo ọjọọ n'ọnwụ n'ihi anyị Mụ na gị, mana tupu Ọ laa n'igwe Wee mena tupu Ọ lakwuru Nna Ya Jesu Dinwenu Jesu mer'onwe Ya Achịcha nke ndụ, Achịcha ndụ Achịcha nke ndụ, Achịcha si n'eligwe Nri n'eny'añụrị, n'añụrị na ndụ ebighị ebi Jesu n'akpọ anyị VERSE 2 Ahụ m bụ ihe oriri, Ọbara m bụ ihe ọṅụṅụ Nke a bụ okwu nke Dinwenu N'ụ Kristi ekwugo, Onye ọbụla Onye nwe anyị kwuru sị Onye ọbụla riri Ahụ m nke Chukwu Nwa kwuru Onye ọbụla sị Onye nzọpụt' ekwugo Nụọ Onye ọbụla Jesu kwuru Onye ọbụla sị Onye nke ṅụr'Ọbara m G'enwe ndụ, Onye ahụ g'enwe ndụ Ọ g'enwe ndụ, enwe Ya ndụ ezie mgbe nile Ebighị ebi, ebighị ebi, ndụ ebighị ebi Jesu n'akpọ anyị VERSE 3 Jesu dị nsọ, Achịcha dị Nsọ Oge ị naana anyị ndụ n'ọzala Chukwu nyere ha achịcha si n'igwe n'ịdị mma Manụ gbua nke anyị Chukwu nyer'anyị Nwa Ya Jesu Kristi Achịcha dị ndụ, Jesu Onye nzọpụta Jesu Nwatur' ejiri chụaja Jesu Onye kpochapụrụ njọ mụ na gị Achịcha dị Nsọ, Ị dị Nsọ

Download the sheet music

NARANU M RIE

NARANU M RIE

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
5 pages
5 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs Hymns
0 0

More lyrics you may want