Full Lyrics
REFRAIN
Nara, nara, nara aja
Biko Chukwu nara aja anyi n'ehunyere Gi
Maka ndi nwụrụ anwụ
K'aja nke a anyi ji akwụgwọ mmehie
Medaa Gi obi maka njọ anyi.
VERSE 1
O Dinwenu, anyi n'arịọ
Ka I were ebere nekwasị anya
N'onyinye anyi n'ebunye Gi
Mak'ezumike na nzọpụta nw'odibo Gi.
VERSE 2
Nye ya ọnọdụ ebebe
N'etiti ndi nke Gi azọpụtagoro
Nuru arịrịọ anyi
Nara onyinye anyi, O Chukwu.
VERSE 3
Ka I meere mkpụrụobi nw'odibo Gi ebere
K'anyi ji achụnyere Gi
Aja otuto nke a, nara ya
Gọzie maka nzọpụta nw'odibo Gi.
VERSE 4
Anyi ji obi umeala
Arịọ ebube eze Gi
Ka I nye ya ezumik' ebebe
Site n'aja nke a anyi ji akwụ ugwọ mmehie
Medaa Gi obi maka njọ anyi.