Full Lyrics
VERSE 1
Nara nara aja, biko Chukwu,
Aja anyị n'ehunyere Gị,
Maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
K'aja nke a anyị ji akwụgwọ mmehie,
Medaa Gị obi maka njọ anyị.
Ọ Dinwenu, anyị n'arịọ,
Ka I were ebere nekwasị anya,
N'onyiny'anyị n'ebunye Gị,
Mak'ezumike na nzọpụta nw'odibo Gị.
VERSE 2
Nye ya ọnọdụ ebebe,
N'etiti ndị nke Gị azọpụtagoro nụ.
Nuru arịrịọ anyị,
Nara n'onyiny'anyị, O Chukwu.
VERSE 3
Ka I meere mkpụrụ obi nw'odibo Gị ebere,
K'anyị ji achụnyere Gị aja ụtọ nke a,
Gọzie maka ntọrapụ nw'odibo Gị.
VERSE 4
Anyị ji obi umeala arịọ eze Gị,
Ka I nye ya ezumik'ebebe,
Site n'aja nke a anyị ji akwụgwọ mmehie,
Medaa Gị obi maka njọ anyị.