MMỤỌ NSỌ NKE SI N'IGWE by Bro Stan — Lyrics

Bro Stan Igbo Pentecost Hymns Prayer Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Mmụọ Nsọ nke'igwe, nụrụ olu anyị. Onye nkasi obi, nụrụ olu anyị. Bịanụ, nduru nke'igwe, bịanụ, wụs'amara, bịanụ, n'ime obi ụmụ Gị, ka ha bụrụ ebe obibi Gị k'anyị zịpụta na ndụ anyị. VERSE 2 Mmụọ Nsọ nke'igwe, nụrụ olu anyị. Ezi onye ndu, nụrụ olu anyị. Bịa, ọkụ nke amara bịanụ, n'ime obi anyị, bịanụ, chụpụkwa ihe niile, n'ekwesịghị ụmụ nke Chukwu tichie ihe Gị Mmụọ nke eziokwu. VERSE 3 Mmụọ Nsọ nke'igwe, nụrụ olu anyị. Olu Chukwu, nụrụ olu anyị. Bịa onye nkuzi nke'igwe, bịanụ, n'obi niile bịanụ, zi anyị ihe omimi, ọlụ nzọpụta nke onye mmehie, ka obi anyị ju na ekele ọma.

Download the sheet music

MMỤỌ NSỌ NKE SI N'IGWE

MMỤỌ NSỌ NKE SI N'IGWE

By Bro Stan
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Pentecost Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want