Full Lyrics
REFRAIN
Nne m'ọma! Ezigbo Nne mo!
Kedu ihe m g'eji kelee gị o?!
Nne m'ọma! Ezigbo Mama mo!
Chukwu gọzie gị, chebe gị o?!
VERSE 1
Maka ahụhụ i tata n'el'ụwa n'ihi mo.
Ụra nile m chụrụ gị n'ụwa, ezigbo nne m'ọma.
VERSE 2
M cheta gị, nne mo, obi n'emeruba mo.
Nne mo, biko ọ gaadịrị gị nma.
VERSE 3
Chineke, biko, gọzie Mama mo.
Chineke, biko, chedo Mama mo.
VERSE 4
Ogologo ndụ n'ahụ ike k'anyị n'arịọ.
Ọganihu na nchedo Chineke k'anyị n'arịọ.
VERSE 5
Otito dịrị Chineke, Onye ziter'anyị Mama.
Ngozi dịrị Nna, Onye na ekesa Mama.