Mo Nso Nke si N'igwe — Lyrics

Igbo Pentecost Hymns Hymns Prayer Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Mọ Nsọ nk'igwe, nur'olu ayi: Onyenkasi, nur'olu ayi: Bianu, Nduru nk'igwe: bianu, Ony'amara: Bianu nime obi umu Gi, Me k'o buru eb'obibi Gi: K'ayi we ziputa ihe ndu ayi N'ayi bu umu nke Chuku: N'ihi na Ọ bu Ony'omiko, Ony'ebere, n'ezie: Onye obi ọma, O juputa kwara n'ihun'anya na Ogologo ntachiobi. VERSE 2 Mọ Nsọ nke si n'igwe, nur'olu ayi: Onye nd'umu Chuku, nur'olu ayi: Bia, ọku nk'amara, bia n'obi ayi, Chup'ihe nile, bu nke nukwesigh umu nke Chuku: Tichie ihè nke Gi, Mọ nk'ezi okwu, K'ayi di kwa k'umu Chuku: n'ihi na Ọ bu Ony'eziokwu: Onye di kwa nsọ: Is'iyi nke ndu; O juputa kwara n'ima mma na Ezi omume rue mgbe nile. VERSE 3 Mọ Nsọ nke si n'igwe, nur'olu ayi: Olu nke Chineke, nur'olu ayi: Bia, Onyenkuzi nk'igwe, nim'obi nile, Zi ay'ihe omimi di n'ọlu nzọputa nke onye nmehie: K'obi ayi jupu'a n'okol'ọma, K'ire ay'juputa n'otuto; n'ihi na Chuku juru anya: Ọ di omimi: Ọ gbara ghari; Ayi bu ndi nmehie n'uw'apugh kwa Ife Ya m'I nọgh nsọ.

Download the sheet music

Mo Nso Nke si N'igwe

Mo Nso Nke si N'igwe

Solfa
Igbo
2 pages
0 Downloads
Pentecost Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want