MMỤỌ NSỌ, ỊKỤKỤ N’ENYE NDỤ by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Pentecost Hymns Prayer Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Mmụọ Nsọ, biko gbadata, Chukwu Mmụọ Nsọ, bịa bịrị n'imem, maka n'ewepu grasia Gị, onwero zii hem bụ, mmadụ bụ ihe rụr'arụ, mmadụ bụ ihenkiti. VERSE 1 Bịa Mmụọ Nsọ, bịa bịrị n'imem, mkpụr'obim naachọ Gị, biko bịrị n'imem. REFRAIN Ịkụkụ ọma n'enyendụ, bịa bịrị n'imem, kụnyem ume Gị, kam wee dịndụ. VERSE 2 Ezindụ rụnk'igwe, bịa nọjue n'imem, gbanworom ndụ mo, kam dịrịmma. VERSE 3 Mụnye n'imem ọkụ nk'ịhụnaanya Gị, k'ọkụ Gị repịasịa ọchịchịrị nke ndụ m. VERSE 4 Nyem Amamihe, Nghọta, Alọ, n'Ike, nyem Ọmụma, Obi dịasọ n'Egwu nke Chukwu.

Download the sheet music

MMỤỌ NSỌ, ỊKỤKỤ N’ENYE NDỤ

MMỤỌ NSỌ, ỊKỤKỤ N’ENYE NDỤ

By Chibi
Solfa
Igbo
1 page
0 Downloads
Pentecost Hymns Prayer Hymns
0 0

More lyrics you may want