Mma-mma, Imeela by Ize Chris — Lyrics

Ize Chris Igbo Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[CHORUS] Mmamma Chineke I meela, Mmamma Chineke I meela. Mmamma Chineke I meela, Chineke I meela ekele o! [VERSE 1] Kedu ihem g'enye Gị? Omemma, mmamma zur'ahụ, ji wee tụọrọ Gị mmamma? Chineke I meela. Mmesoma Gị na ndụ m, ọnụm g'apụgh' ịkọchasi Ya, agam atụrụ Gị mmamma, Chineke I meela. [VERSE 2] Nwannem bịa lee ihe ọma Chineke n'emere mo, aka ọrụ mara mma, Chineke I meela. Soronụm kele Ya maka ọrụ ebube Ya n'ebe m nọ, k'anyi si Ya mmamma, Chineke I meela. [VERSE 3] Ya kere gị, nye gị ndụ n'ọgụgụ isi, wee cheo gị mma, Chineke I meela. Ọ bụ onye g'akọchasi mmesoma Chineke? Bịanụ jaa Ya mma, si Chineke n'Omeela.

Download the sheet music

Mma-mma, Imeela

Mma-mma, Imeela

By Ize Chris
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want