Full Lyrics
[1ST CHORUS]
Mmadụ ntu k'ị bụ na ntu k'ị g'anachigha.
[VERSE 1]
Mmadụ lee ahịhịa dị n'ọhịa,
n'ụtụtụ ha niile miri juru,
ha jụkwara n'añụrị,
n'uhuruchi ha akpọnwụsịa.
[VERSE 2]
Nwa ogaranya lee ahịhịa dị n'ọhịa,
n'ụtụtụ ị bụ ogaranya,
n'uhuruchi ị buru onye nwụrụ anwụ.
[VERSE 3]
Onye eze lota n'ụwa anyị nọ naagafe
ka olo, lee eze mmadụ niile
bụ ihe oriri nke anwụrụ.
[2ND CHORUS]
Mmadụ chetakwa n'ị si na ntu,
na ntu k'ị g'alaghachikwa
mgb' ị tụghị anya.