Full Lyrics
REFRAIN
Lee na nwanne anyị alaba ga n'ebe o siri bịa n'ụwa.
Onye dị ndụ lee ihe gaabụ mmecha ya,
Nke gị n'eche gị, dịbụ a nkwadebe.
Mmadụ bụ aja, mmadụ bụ ntụ,
Mmadụ bụ ihe efu n'ụwa, mmadụ bụ ihe efu n'ụwa.
Ọ hapụgo ihe ụwa, gaba n'ihu Chukwu
Maka ụgwọ dịrị ndụ ya,
Nke omume ka o metara n'ụwa nke a gaakwụ ya n'igwe.
VERSE 1
Onye ka dị ndụ naakpagharị n'elu ụwa,
Chee n'ụwa bụ ebe obibi,
Lee ihe ị gaabụ otu ụbọchị.
VERSE 2
Ugbua bụ oge dịrị gị maka ịchọta
Ala eze nke Chukwu,
Maka nchegharị dịkwara gị,
Maka onye nwụrụ anwụ.
VERSE 3
Kedu uru ọ gaabara gị ma ị ritesịa
Akụ ụwa niile n'uru,
Mkpụrụobi gị efuo n'arị gị n'igwe,
Jụọ onwe gị ajụjụ ma zaa kwa onwe gị.
VERSE 4
Meghepu obi gị, meghepu obi gị,
Ka ihe nke Dinwenu bata n'obi gị,
Ka ị ghọta n'ụwa a bụghị ebe obibi,
Eligwe bụ ụlọ anyị, eligwe bụ ụlọ anyị.