Full Lyrics
INTRO
Otito diri Chineke n'elu,
Otito diri Chineke n'elu kach'elu,
n'uwa udo diri ndi mmadu
nd'ihe ha n'aso Chukwu.
VERSE 1
Anyi etoo Gi, anyi ekwuputa oruoma Gi, anyi esekpuere Gi.
Anyi edoo Gi ebube, anyi ekele Gi n'ihi nnukwu ebube Gi.
REFRAIN
Otito diri Chineke.
VERSE 2
Osebuluwa Chineke, Eze nk'igwe, Chukwu Nna ji ike nile, Onye nw'anyi Jesu Kristi so...
VERSE 3
...s'otu nwa Chineke muru. Dinwenu anyi bu Chukwu, Nwaturu Chukwu, Nwa nke Nna. Onye n'ekpochapu njo,
VERSE 4
...njo nk'uwa, meere anyi ebere. Onye n'ekpochapu njo, njo nk'uwa, nara ario anyi. Onye n'ano n'aka nri Nna, meere anyi, meere anyi ebere.
VERSE 5
N'ihi na so Ngi di aso. So Ngi bu Dinwenu. So Ngi, O! Jesu Kristi. So Ngi eh! So Ngi di aso.
VERSE 6
Kacha di elu, nyere Muo Nso, n'ebube Chineke, Chineke Nna. Amen.