MISSA IFUNANYA - EKWERE M N'OTU CHINEKE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Creed (I believe) Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CREED Ekwere m n'otu Chineke, Nna ji ike nile. Onye mere eluigwe n'ala, n'ihe nile a pụrụ ịhụ anya na ndị apụghị ịhụ anya. Ya n'otu Onyenw'anyị Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ. Nna mụrụ tupu ụwa tụwa nile. Chukwu si na Chukwu, Ihe si n'ihe. Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu. A mụrụ Y'amụ, emeghị Y'eme. Ya na Nna bụ otu ihe n'ụdịdị ebighebi Ha jiri buru Chukwu. Onye si na Ya mee ihe dum. Onye mak'ihi anyị bụ mmadụ na mak'ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata. O weere ahụ na Vejin Maria, site na Mmụọ Nsọ, O buru mmadụ. A kpọgbuo Ya n'obe, A kpọguo Ya n'obe n'ihi anyị, n'oge ọchịchị Pọntọs Paịlet. Ọ taa ahụhụ nwụọ, elie Ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nk'atọ ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo. Ọ bilitere n'ọnwụ, Ọ bilitere n'ọnwụ. Ọ bilitere n'ọnwụ, Ọ bilitere n'ọnwụ. Rọgọrọ n'eluigwe, nọrọ n'aka nri Nna. Ma Ọ gaabịa ghachi ọzọ n'ebube Ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Onye ọchịchị Ya n'enweghị njedebe. Ekwere m na Mmụọ Nsọ, Dinwenu na Onye n'enye ndụ. Onye si na Nna na Nwa pụta, Onye a n'esekpuru. N'etookodo Ya na Nna na Nwa. Onye si na ndị amụma kwuo okwu. Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị Nsọ, bụrụ Katọlik, bụrụ kw'apọstọlik. Ekwuputa m otu mmirichukwu maka mgbaghara njọ ga. A na m atụ anya, a na m atụ anya, mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa g'abịa nụ. Amen, Amen. Amen. Amen.

Download the sheet music

MISSA IFUNANYA - EKWERE M N'OTU CHINEKE

MISSA IFUNANYA - EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
8 pages
3 Downloads
Creed (I believe) Hymns
0 0

More lyrics you may want