Full Lyrics
Otito dịrị Chineke n'elu, n'elu kach'elu.
N'uwa, udo dịịrị ndị mmadụ ndị Chukwu nwere mmasị n'ebe ha nọ.
Anyị ajaa Gị mma. Anyị ekwupụt'ọrụ ọma Gị.
Anyị esekpuoro Gị. Anyị etoo Gị.
Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị,
Osebuluwa Chukwu, Eze nke eluigwe,
Chukwu Nna ji ike nile.
Nw'anyị, Jesu Kristi,
So otu Nwa Chineke mụrụ,
Dinwenu anyị bụ Chukwu,
Nwa atụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna.
Onye naekpochapụ njọ nk'uwa,
meere anyị ebere, ebere.
Nar'arịrịọ anyị.
Onye nọ n'aka nri Nna,
meere anyị ebere, ebere.
So Gị bụ Dinwenu,
So Gị, Jesu Kristi,
kachasị dị elu,
nyere Mmụọ Nsọ:
N'otito Chukwu Nna. Amen.