Full Lyrics
INTRO
K'anyị laba nụ na Missa agwụsigo
CHORUS
Laba nụ
Ekele dịrị Chukwu
K'anyị laba nụ na Missa agwụsigo
Ekele dịrị Chukwu
Ọtịto dịrị Chukwu
K'anyị laba n'udo na Missa agwụsigo
Ekele dịrị Chukwu.
VERSE 1
Dinwenu ka ngọzi gị dube anyị
Mee ka ịhụnanya gị juputa n'ime anyị
Biko mee k'anyị jiri ezigbo obi na eso ụzọ gị.
VERSE 2
Anyị n'enye gị ekele n'esekpuru gị
Maka oziọma gị na enye añụrị
Ka mkpụrụ oriri dị asọ anyị natara
Ju n'obi na n'ime ndụ anyị.
CODA
Ọtịto dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ,
Etu ọ dị n'izizi na kịtaa na mgbe niile
Ruo ebighebi
Amen!