Full Lyrics
INTRO
K'anyị laba nụ na Missa agwụsịgo
REFRAIN
Laba nụ Ekele dịrị Chukwu
K'anyị laba nụ na Missa agwụsịgo
Ekele dịrị Chukwu
Otito dịrị Chukwu
K'anyị laba n'udo na Missa agwụsịgo
Ekele dịrị Chukwu.
Ekele dịrị Chukwu.
VERSE 1
Dinwenu ka ngọzi gị dube anyị
Mee ka ịhụnanya gị juputa n'ime anyị
Biko mee k'anyị jiri ezigbo obi na eso ụzọ gị.
VERSE 2
Anyị n'enye gị ekele n'esekpuru gị
Maka Oziọma gị na enye aṅụrị
Ka mkpụrụ oriri dị asọ anyị natara
Ju n'obi na n'ime ndụ anyị.
CODA
Otito dịrị Nna na Nwa na Muọnsọ
Etu o dị n'izizi na kitaa na mgbe niile
Ru emgbe ebighebi Amen!