Mba Di Nso Ezukola by Mike Okey Anyanwu — Lyrics

Mike Okey Anyanwu Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[EBE UNU BATARA BỤ UGWU ZION] Ma k'anyị jenu fee Chineke dị ndụ N'eb'obibi dị mma Gbuo akper'ala nye Dinwenu Ọkụ n'erere. [MBA DỊ NSỌ EZUKỌLA] Lee, ndị agọziri agọzi ezukọla, mba dị nsọ. Anyị bụ ndị ahọtaara abịawo, Ha abịawo k'anyị fee Chineke n'aja Missa dị asọ. Verse 1 Anyị bụ ihe nkụwa n'ezi Ndị Chineke họọtaara Onwe ya. Lee k'anyị ji bịa inye ya nsọpụrụ kacha elu. Verse 2 Dinwenu obi ebere gị eruwo mụ aka. Anyị bụ ndị nke gị, anyị bụ ndị ahọtaara abịawo k'anyị fee Gị. Verse 3 Imela k'anyị bụrụ agbụrụ ndị eze, Oh Dinwenu. Mee nụ k'aja dị anyị nsọ n'eziokwu gị. Verse 4 Nye ya ekene, Ya kere ihe nile. Itosiri Onye nwe anyị. K'a nye gị ekene n'otito. N'ihi na Ọ bụ gị kere ihe nile. Anyị etoo gị Nna n'enye Gị ekene. [KWEERENU CHINEKE UKWE ỌHỤRỤ] Kweerenu Chineke ukwe ọhụrụ. Werenu ike unu nile kwere y'ukwe.

Download the sheet music

Mba Di Nso Ezukola

Mba Di Nso Ezukola

By Mike Okey Anyanwu
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want