Full Lyrics
REFRAIN
Nne mara mma, nne di ngọzi,
nne di ebere, nne di asọọma,
nne Maria nne Kristi,
nne ọha niile, rịọtara anyị arịrịọ.
VERSE 1
Dị ka n'Agbamakwụkwọ nke Kena,
Maria nne nke nzukọ,
anyị n'arịọ Gị rịọtara anyị arịrịọ.
VERSE 2
Cheta O Maria,
n'ọdịghị onye ọbụla nke gbakwụtere Gị,
gbara aka laa.
Maria biko nne,
ahapụkwala anyị, rịọtara anyị arịrịọ.
VERSE 3
Anyị gbaba na nchedo Gị,
O nne nke Chukwu onye dị nsọ.
Elelikwala arịrịọ anyị,
O Maria rịọtara anyị arịrịọ.