Full Lyrics
REFRAIN
Chukwu, biko, ezi Nna, gbaghara, doo.
Agbakọkwala nmehie ndị anyị mere megide Gị.
Chineke, biko.
Chukwu, biko, ezi Nna, gbaghara, doo.
Agbakọkwala nmehie ndị anyị mere megide Gị.
Chukwu, biko.
VERSE 1
N'ime ogbu mmiri ka m nọ n'akpọku Gị, biko, Osebulụwa,
VERSE 2
Nụrụ arịrịọ anyị. Ị gbakọba nmehie anyị, Dinwenu,
VERSE 3
Onye g'adịrị? Ọ bụ onye g'adịrị?
Nụrụ arịrịọ anyị n'arịọ, Dinwenu.
Ka mkpu akwa anyị n'ebe ruo Gị ntị.
VERSE 4
Mkpụrụobi ndị kwere na Gị n'atụ anya Gị;
Anyị chekwubere n'okwu Gị, ezi Chineke.