Full Lyrics
[VERSE 1]
Anụrụ m olu Onye nwem Jesus k'Ọ naasị,
Onye ka m gaeziga, Onye gaeje kwara anyị o?
Anwụrụ m ọnwụ n'elu obe n'ihi gị,
Onye ka m gaeziga, Onye gaeje kwara anyị o?
[CHORUS]
Gị onye kwere na Jesus,
Gị onye kwere na Jesus,
Gị onye kwere na Jesus Kraịst,
Buru obe gị, o bedi arọ.
Legide Jesus anya,
Legide Jesus anya,
Legide Jesus anya,
Buru obe gị, ike agwụla gị o.
[VERSE 2]
Anụrụ m olu Onye nwem Jesus k'Ọ naasị,
Gaanụ n'elu ụwa dum k'unu kwusaa Oziọma nke m.
A ga m enyekwụ anụ ngọzi ebighị ebi,
Onye ka m gaeziga, Onye gaeje kwara anyị o?
[VERSE 3]
Anụrụ m olu Onye nwem Jesus k'Ọ naarịọ,
Hụ Chineke gị n'anya n'ike n'ime gị niile,
N'ihi na ịhụnanya bụ iwu nke kacha elu,
Hụrịta onwe ụnụ n'anya, Otu M siri hụkwa ụnụ.
[CODA]
Amen, Amen, ike agwụla gị o.