Leenu Ya by Chukwudinka I. C — Lyrics

Chukwudinka I. C Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Lee nu ya ihe anyị bụ k'ọ bụ na mbụ Lee nu ya ihe ọ bụ ugbua Ka anyị nile ga abụchaa mgbe oge g'eru VERSE 1 Okw'e bu n'ọnụ onye ọzọ Ọ dị k'e bu osisi kpọrọ nkụ Lee kwa nu n'ọ bụ sọ ahụhụ Ka anyị nile ga gaa VERSE 2 Mkpụrụ ụbọchị ole gaagal Anyị na ya nọ Anyị na ya n'ekwu okwu Kwu naakpa nkata Mana ugbua ọ nọzi n'ozu VERSE 3 Lee nu onye anyị na ya n'ezie Rie nụ, aṅụ k'ọ dị na n'ozu Ụwa nile a enweghi isi Ụwa bụ ihe nkịtị VERSE 4 Lee nu ya biau nụ hụ nụ ya Ihe ahụ ọ bụ tata Ka anyị nile ga abụchaa Mgbe oge g'eru VERSE 5 Ezi nwanne m jụa onwe gị ajụjụ Onye k'ọ ga bụ echi Ọ bụ mụ, ọ bụ ngị Onye ọbụla kwado onwe ya na oge agwụla

Download the sheet music

Leenu Ya

Leenu Ya

By Chukwudinka I. C
Solfa
Igbo
1 page
14 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want