Full Lyrics
SOLO
Lee nụ ụmụnne m ụlọ obibi Osebulụwa
REFRAIN
Lee nụ ụmụnne m ụlọ obibi Osebulụwa
Ka o siri maa mma dịka ebe obibi ndị eze
Ka o siri maa mma
VERSE 1
K'anyị jere ije n'ụlọ Chineke Nna
Ọ dịka ugwu Zion a gaaghị ama jijiji
Lee nụ ya, lelee nụ ya
Kwelite nụ k'anyị je ụlọ obibi Osebulụwa
Mgbe a siri m k'anyị je
REFRAIN II
N'ụlọ Chineke Nna, n'ụlọ Chineke Nna
Onye bụ eze ndị eze
Onye bụ Odogwu
Onye bụ ihe ike a
Odogwu, Odogwu dị k'e maghị k'ọ bụ
Onye n'eche m n'eche
K'anyị ba onye n'eche m n'eche
Ngwa nụ k'anyị jee, mba Chineke k'anyị je e nu
Jikwa ya ngwa maka, ọ kanyị je e nu n'ụlọ Chineke a maa mma