Full Lyrics
[DUET IN ADAGIO]
Jesu Nwa atụrụ Chukwu
sọ otu nwa Chineke mụrụ
O jiri chụọ aja n'elu obe
Obiligo n'ọnwụ.
[CHORUS]
Jesu m o ebiligo n'ọnwụ
Kristi m o emerig'ik'ọnwụ
Kristi Dinwenụ m akpọgburu n'obe
Obiligo, O merig'ik'ọnwụ.
Aleluya aleluya
Aleluya Amen, aleluya Amen,
Aleluya ekele dịrị Chukwu.
Amen. Kristi ebiligo.
[VERSE ONE]
Mana biko chere o
Ọ bụ Kristi ekpegburu ekpegbu?
Kristi a pịarụ ụtarị?
Kristi a mara ụra?
Kristi a gburu asọ?
Ọkwa Onye eboro ebubo?
Onye eboro obe dị arọ?
Ọkwa Kristi ekpuber'okpogwu?
Onye a gbara ọtọ?
Ọkw'onye a kpọgburu n'obe?
Kristi a mara ube, k'I siri n'Obiligo?
Eee O biligo.
Nwannem, wer'ọsọ bja,
ajụzị l'ok'ajụjụ
bịa hụr'ili eb'a dọnyere Ya
mana O merig'ik'ọnwụ.
[VERSE TWO]
N'ezi is'ụtụtụ nkubochi atọ,
ka Meri gara it'ude n'ahụ Onye nwe anyị,
Ih'ọhụrụ gbara ya gharịị
nnukwu egwu jidere ya,
O tirok'enkpu, h'eburugokwanụ Ya,
mana Mmụọzi jụrụ ya,
ked'ih'I ji achọ Onye dị ndụ n'ala ndị nwụrụ anwụ?
Kristi ebiligo.
[VERSE THREE]
Kristi emerig'ọnwụ eh!
O merig'ọnwụ
Ọnwụ O jiri ny'anyị ndụ
Onye mmeri
Ony'iro gbab'ujá n'efu n'ezie
Ike Kristi eh!
Onye mmeri merigo eh!
Onye mmeri
ọchịchịrị laba n'elu ụwa, laba o na
Ihe Kristi a chakego eh!
Onye mmeri
Ọnwụ olee ike gị eh?
Ọnwụ olee ụfụ gị?
Ọnwụ olee mmeri gị?
Nwa Chukwu emerigo.
Ndị agha kedụ eb'unu nọ?
O biligo
ili olee ike gị?
Nwa Chukwu emerigo
Onye mmeri
Onye mmeri ebiligo
ụwa ṅụrịba
Ụzụ tụba nụ o!
Nkpụ daba nụ o!
Egwu daba nụ o!
Kristi b'Onye mmeri.