KRISTI EMERIGO ONWU by Chibi — Lyrics

Chibi Igbo Easter Hymns Anthems Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[DUET IN ADAGIO] Jesu Nwa atụrụ Chukwu sọ otu nwa Chineke mụrụ O jiri chụọ aja n'elu obe Obiligo n'ọnwụ. [CHORUS] Jesu m o ebiligo n'ọnwụ Kristi m o emerig'ik'ọnwụ Kristi Dinwenụ m akpọgburu n'obe Obiligo, O merig'ik'ọnwụ. Aleluya aleluya Aleluya Amen, aleluya Amen, Aleluya ekele dịrị Chukwu. Amen. Kristi ebiligo. [VERSE ONE] Mana biko chere o Ọ bụ Kristi ekpegburu ekpegbu? Kristi a pịarụ ụtarị? Kristi a mara ụra? Kristi a gburu asọ? Ọkwa Onye eboro ebubo? Onye eboro obe dị arọ? Ọkwa Kristi ekpuber'okpogwu? Onye a gbara ọtọ? Ọkw'onye a kpọgburu n'obe? Kristi a mara ube, k'I siri n'Obiligo? Eee O biligo. Nwannem, wer'ọsọ bja, ajụzị l'ok'ajụjụ bịa hụr'ili eb'a dọnyere Ya mana O merig'ik'ọnwụ. [VERSE TWO] N'ezi is'ụtụtụ nkubochi atọ, ka Meri gara it'ude n'ahụ Onye nwe anyị, Ih'ọhụrụ gbara ya gharịị nnukwu egwu jidere ya, O tirok'enkpu, h'eburugokwanụ Ya, mana Mmụọzi jụrụ ya, ked'ih'I ji achọ Onye dị ndụ n'ala ndị nwụrụ anwụ? Kristi ebiligo. [VERSE THREE] Kristi emerig'ọnwụ eh! O merig'ọnwụ Ọnwụ O jiri ny'anyị ndụ Onye mmeri Ony'iro gbab'ujá n'efu n'ezie Ike Kristi eh! Onye mmeri merigo eh! Onye mmeri ọchịchịrị laba n'elu ụwa, laba o na Ihe Kristi a chakego eh! Onye mmeri Ọnwụ olee ike gị eh? Ọnwụ olee ụfụ gị? Ọnwụ olee mmeri gị? Nwa Chukwu emerigo. Ndị agha kedụ eb'unu nọ? O biligo ili olee ike gị? Nwa Chukwu emerigo Onye mmeri Onye mmeri ebiligo ụwa ṅụrịba Ụzụ tụba nụ o! Nkpụ daba nụ o! Egwu daba nụ o! Kristi b'Onye mmeri.

Download the sheet music

KRISTI EMERIGO ONWU

KRISTI EMERIGO ONWU

By Chibi
Staff & Solfa
Igbo
3 pages
1 Downloads
Easter Hymns Anthems Hymns
0 0

More lyrics you may want