Full Lyrics
INTRO
Umu'wa n'uruo lu m ka m n'gba akaebe m biliten'onwu Kristi.
Nwa nke Chukwu onye akpogburu n'obe nwuo onwuihere,
ka o ruru ubochi ato ya si n'onwu bilie.
Eh lee eb'I no? I gar'ahia? I gara ozi? jer'omugwo?
Eh eh chai! mmeh nto Kristi'e merigo' nwu, mmeh nto Kristi'e merigo.
CHORUS
Kristi'ebiligo eh, Kristi'emerigo' nwu.
Kristi'ebiligo eh, nuribanu n'omerigo eh.
Eh onwu olee ike gi?
Eh onwu olee ufu gi?
Mgbe Kristi bilitere n'onwu zaanu moo olee eb'I no?
VERSE 1
Umunnem bianu lee n'ili emeghela eh.
Ik'onwu adawo mba n'ezie Kristi emerigo eh.
VERSE 2
Uwa n'ile nuriba o n'okpara Chineke 'merigo eh.
VERSE 3
Gwa mba n'ile si ha na Kristi'ebiligo eh.
Mmuoma Chineke gwara umunwanyi'ahu si ha tule'gwu na Kristi'akpogburu n'obe ebiligo eh.
VERSE 4
Ik'ochichiri adawo mba n'ezie Kristi'emerigo 'onwu.
Tibenu mkpuonu n'egoli na Kristi'emerigo eh.