Full Lyrics
REFRAIN
Alleluia, oh Kristi e merigo
Alleluia, oh Kristi e merigo
K'anyị tienụ Alleluia, oh Kristi e merigo
Nwa Chineke e gburu egbu n'elu ụwa
Kristi e merigo, ọnwụ e
Onye ahụ e gburu egbu n'elu ụwa
Kristi e merigo
Ọnwụ e nweghị ike n'ebe ọ nọ, ọnwụ e nweghị ike ọbụla eh
Ọnwụ e nweghị ike, ọnwụ e nweghị ike
Ihe ukwu mere
K'anyị tibe kwanụ egwu ọṅụ, ọnwụ e nweghị ike ma ọlị
Ihe ukwu
Maka na Dinwenu e biligo, ọnwụ e nweghị ike
Dị k'e biligo
N̄ụrịba n'o biligo n'ọnwụ
N̄ụrịba n'o biligo n'ọnwụ
Ihe ukwu mere
Alleluia, Alleluia
Oh Kristi e merigo
Oh Alleluia
Oh Kristi e merigo
K'anyị tienụ Alleluia
Ọ merigo
K'anyị tienụ Alleluia
Oh Kristi e merigo ọnwụ
K'anyị tienụ Alleluia, Alleluia
Kristi e merigo ọnwụ
VERSE 1
Mary biliri n'ụtụtụ ma were ọsọ gawa n'ili Jesu
Ite ya ude, ite ya ude isi ọma
Mary were ọsọ, were ọsọ gawa n'ili onye nwe anyị
Ụmụnwanyị ndị ọzọ sokwa ya n'azụ
Ma mgbe ha rutere n'ili Jesu ọ tọgbọzị n'ankịtị
Ha hụghị ya n'elu ma ọ bụ n'ala
Oh Kristi e merigo ọnwụ
VERSE 2
Mgbe Pita nụrụ ozi na ili tọgbọzị n'ankịtị
Ọ were ọsọ, were ọsọ gawa n'ili Dinwenu
Ọ lere anya, lere anya n'ime ili na mgbagwoju anya
Mana Jesu anọghị n'ime ili
Ụmụnne m o
Nwa azụ ya na ya so gbara aka ebe n'ili tọgbọ n'ankịtị
Ngwa leenụ
Akwa ula rị e jiri fuchi e ahụ ya
K'apịarapịa n'ili
Eh! Ọ biligo ụmụnne m
Ihe ebube mego Alleluia
VERSE 3
Mary nọ naadikpugharị n'ọnụ ili na mgbagwoju anya
Dinwenu anọghịzị n'ime ili
Ihe ukwu
Ili tọgbọzị n'ankịtị
Mary chọrọ ya ebe niile ma ọ hụghị ya
Mana elu ma ọ bụ n'ala n'aka nri chọrọ Jesu ebe niile
Ọ chọrọ ya eyi n'aka ekpe oh
Otu Mmụọ ọma gwara ya wee sị
Dinwenu e kuligo
Ngwa gawa gwa ụmụ azụ
Jesu n'ọ sigo n'ọnwụ kulite