Full Lyrics
VERSE 1
Na Bethlehem nke Judea
Obodo ọma n'eb'a hụ ka a mụrụ mma
CHORUS
Nuel, Eze k'eze, nnwa ka nnwa
Lee nụ kpakpando ya
Sobe nụ kpakpando ya
Ọ g'eduru nụ wee rue n'ebe nibere ya
VERSE 2
Ndị mmụọ ọma si n'eligwe gbadata
Zute ndị nch'atụrụ ebe ha n'ech'atụrụ ha
N'uchichi n'im'ọhịa
Ha ji ozi ọma, ozi nke nzọpụta
Ha sị: Onye nzọpụt'a bịago
Kristi nnwa ka nnwa
Ndị mmụọ ọma n'ekwu
Kwe ukw'otito nye Chukwu
Ha n'ekwe sị otito dịrị Chineke
N'elu kasi elu
Udo dịrị n'ụwa nd'ihe ha n'asọ Chukwu