Full Lyrics
[REFRAIN]
Ọbọrọchị kelechi eh! Ya kelechi ya eh!
Ọbọrọchị kelechi ya ewo!
El' ụwa dị ogbu
Ịhụla nụ n'ụwa enweghị isi o!
Ụwa enwegh' ọdụ o!
Ọ bụ sọ Chi naelo, n'aka ya kam gara kuo Paa!
Onyinye dị mma kam g'eji bịa n'ihu gị Nna
Chukwu, ọ dighi onye dị ka gị yoo!
Mmh! Eh! Aa ha! yoo!
Ee he! N'aka chukwu kam gara kuo Paa!
[VERSE 1]
Chee echiche nwa nne m banyer' onwe gị
Oge Chineke nyere mmadụ n'ụwa
Ụwa b'ahịa; ih' onye zụtara ọ buru laa.
Elu ụwa b'ahịa, onye zụtara nke ya ọ laa!
[VERSE 2]
Ị man' omenma metara n'elu ụwa k'ọ jia la mmụọ
Ụwa a bụgh' ebe obibi
Onye ji n'ụwa em' ọnụ anyị nile bịar' abịa!
Mmadụ nile bụ ala!
[VERSE 3]
Ony' ebulu ụwa n'isi!
Ọnya zọ n'ụzọ
Onye chụbu ụwa n'ike, kwụgba anarị ya ọsọ
Ngụ were ghar' osisi ka kpara ya
Tụkwasị Chukwu obi m emesịa n'ọ gaadị mma