KELECHI by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Offertory Hymns Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ọbọrọ chi kele Chi eh! Ya kele Chi ya eh! Ọbọrọ chi kele Chi ya ewo! Eluwa dị ogbu. Ị hụlanụ n'ụwa enweghị, ụwa enweghị ewo! Ọ bụ sọ Chi naelo, n'aka Ya kam ga rakuo. Sị elu ụwa bụ ahịa! Ewo! Na Chineke kam ga rakuo paa! Onyinye dị mma kam geji bịa n'ihu Gị Nna. Chukwu ọ dị onye dị ka Gị! Iyoo! mmh! Eh! Aha! Iyoo! Ehe! N'aka Chukwu kam ga rakuo paa! VERSE 1 Chee echiche nwanne m banyere onwe gị. Oge Chineke nyere mmadụ n'ụwa n'agwụ agwụ. Ụwa b'ahịa, ihe onye zụtara ọ buru laa. El'ụwa b'ahịa, onye chaa nke ya ọ laa! Ụwa b'ahịa, ndị b'anyị l'ụwa b'ahịa nwo! El'ụwa b'ahịa ndị n'eje ndị n'alaa! VERSE 2 Ị mara onwe nma n'eme r'onwe ya, ome njọ n'eme r'onwe ya. Ihe onye metara n'el'ụwa k'i ji ala mmụọ! Ụwa abụghị eb'obibi. Onye ji l'ụwa n'ọnụ. Anyị nile bịasa bịa! Mmadụ nile g'ala! VERSE 3 Onye bu l'ụwa n'isi Ony'azọ n'ụwa zọ. Onye Chukwu warị ke, ụwa gbanarị ya n'ọ sọ! Ngwọrọ ghar'osisi a k'akpara ya! Tukwasi Chukwu anya.

Download the sheet music

KELECHI

KELECHI

By JUDE NNAM
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Offertory Hymns Hymns Sacred songs
0 0

More lyrics you may want