Full Lyrics
REFRAIN
K'ebube Gị Chineke juputa na ụlọ nkea,
bịa do ya nsọ ka ọbụrụ ebe dị nsọ,
obi dị ebube, ala dị nsọ;
ka ebea bụr' ebe dị nsọ,
obi dị ebube n'ụdị ya;
ebe anyị g'ezute Gị bụ ebe dị nsọ.
VERSE 1
N'oge Moses I gosiri ebube Gị
ozutere Gị n'ala dị nsọ.
K'anyị hụ ihu Gị,
k'anyị hụ ebube Gị n'ụlọ nsọ Gị,
k'anyị ju n'ịdị asọ Nna;
VERSE 2
Si nụ n'anwụrụ nk'isens zute ndị Gị,
ka ebea nile juputa n'adịma asọ.
K'anyị hụ ike Gị,
k'anyị hụ ebube Gị n'ụlọ nsọ Gị,
k'anyị ju n'ịdị asọ Nna;
VERSE 3
Bịakwasị n'alta nkea mee
k'aja anyị si na ya achụnyere Gị
ghọrọ aja dị nsọ.
K'anyị fee Gị,
k'anyị too Gị n'ụlọ nsọ Gị,
k'anyị ju n'ịdị asọ Nna;
VERSE 4
Okwu Gị bụ mmụọ,
okwu Gị bụ ndụ Chineke
Okwu Gị bụ adịma asọ.
K'anyị nụ olu Gị,
k'anyị debe iwu Gị deb'okwu Gị,
k'anyị ju n'ịdị asọ Nna;