KA ANYI JEE N'ULO NSO by Chidi Zeigwe — Lyrics

Chidi Zeigwe Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ka anyị jee n'ụlọ Chineke Otito kwesịrị Dinwenu Nye kwa ya ekele N'ihi na ndụ o nyere anyị Kpọrọ y'isi ala n'ụlọ nsọ Kele ya. VERSE 1 Bata n'ụlọ nsọ nwa Chineke Kele ya, sekpuoro ya Bunye y'onyinye Maka udo, n'kwaakụ n'ụba Ndụ o nyere anyị Dinwenu, mmamma ekele. VERSE 2 Chukwu onye ebere Gbaghara mmehie nk'ụmụ gị Dinwenu gbaghara anyị njọ Atụtụ njọ Gbachiri obi ụmụ Chineke Oh Dinwenu, ma nye anyị ngọzi gị. VERSE 3 Ka anyị jee n'obi kele ya Na ndụ o nyere anyị Ka anyị jee n'obi Nye Chukwu wee rịọ ya Mgbaghara njọ Ka anyị jee n'obi Nye Chukwu onyinye mara mma Ka anyị jee n'obi jaa ya mma Gị nwa Chineke Ka anyị jee n'obi nụrụ ozi ọma.

Download the sheet music

KA ANYI JEE N'ULO NSO

KA ANYI JEE N'ULO NSO

By Chidi Zeigwe
Solfa
Igbo
2 pages
5 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want