Full Lyrics
CHORUS
K'anyị kpọọ isiala nye Onyenweanyị, Onyenweanyị.
K'anyị kpọọ isiala nye,
Oseburụwa Onye kere igwe n'ala.
VERSE 1
Ụmụ Chukwu k'anyị jee,
K'anyị jee n'ụlọ Onyenweanyị,
K'anyị jee gbuoro Ya ikpere daara Ya n'ala.
VERSE 2
Onyeọbụla kulite k'anyị jee,
K'anyị jee kele Chineke, tụọrọ Ya mma mma.
VERSE 3
Aja dị nsọ k'anyị n'achụrụ Ya,
Aja dị oke ọnụ k'anyị n'achụ.
VERSE 4
Batawanụ, ụnụ bụ ndị nke Ya,
Batawanụ k'anyị kele Chukwu.