Full Lyrics
[REFRAIN]
K'anyị jee na Calvary,
ebe Jesu koro n'elu obo,
k'anyị be akwa,
be akwa akw'alịlị,
na Kristi Eze anyị anwụrụgo n'obe.
[VERSE 1]
Ndị iro huru ndị ori,
maa Onye Nzọpụta ikpe ọnwụ akpọgbue Ya n'obo.
Ọnwụ o, ọnwụ o, ọnwụ o,
ọnwụ ihere n'elu obe.
[VERSE 2]
Ahụhụ niile Jesu tara n'elu obe,
akajụ emere Ya, ịtarị apịara Ya,
okpu ogwu ekpubere Jesu,
bụ n'ihi anyị o.
[VERSE 3]
Jesu koro n'elu obe n'ime nnukwu ahụhụ,
Jesu koro n'elu obe n'ime nnukwu ahụhụ,
n'ime nnukwu ahụhụ.
Otiri mkpu sị ọgwụsịgo, hupata isi.