Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bu ebe diegwu!
Nke a bu Ulo nso Chukwu,
O n'uzo nke eligwe.
A g'akpo ya, Obieze Chukwu di nso.
VERSE 1
O Nna ji ike nile, anyi abiago ikpo isi ala nye Gi.
Meere anyi ebere, anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 2
Anyi biara n'iru Gi, Chineke, inye Gi ekele kwesiri Gi.
Gee nti nur'ekpere anyi, anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 3
Gee nti nuru olu anyi, gee nti nur'aririo anyi.
Denye aha anyi n'akwukwo ndu, anyi biara n'obi Gi Chukwu.
VERSE 4
Anyi gaefe Gi uwa tuwa, biko Chukwu mee k'anyi binyere Gi.
Ka ngozi Gi rukwasi anyi Chineke, anyi biara n'obi Gi Chukwu.