Jesu, Onye Nmeri Ebiliwo by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Alleluia ọ biliwo, ọ biliwo Jesu a. Kpọghara n'elu be Onye nmeri, Alleluia ọ biliwo. Ọ biliwo, ọ biliwo Jesu a, Kpọghara n'elu be Onye nmeri. VERSE 1 N'ụtụtụ ka ụmụ nwanyị Jere n'ili ite ude n'ahụ Jesu. Mmụọma si n'igwe gbadata n'ili Wee sị ha na ọ biliwo. VERSE 2 Mary n'ebe akwa n'azụ chọ ahụ Jesu, Mary n'eti mkpu n'ili Jesu. Mary n'akwọgharị ebe n'ili Jesu, Mgbe o zutere Dinwenu. VERSE 3 Mary emetụkwanam aka N'ihi na akarom wee rịgoro n'igwe. Gabazia ga gwa ụmụ azụ m Ka ha gaba na Galilee, Ebe ahụ ka m g'anọ gosi n'onwe m n'ụwa. VERSE 4 Alleluia Onye nmeri ebiliwo, Kristi Onye nmeri ebiliwo. Tobenu Chineke, Ọ bụ Dike n'agha, Dike nadụ mkpa. Odogwu akataaka, O meriri ọnwụ. Kwansụ meriri ọnwụ. Mary ahụgo ya, Peter ahụgo ya, Ndi mmụọ ozi n'ekwe, Ndi ụmụ azụ ahụgo ya.

Download the sheet music

Jesu, Onye Nmeri Ebiliwo

Jesu, Onye Nmeri Ebiliwo

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Easter Hymns Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want