Full Lyrics
CHORUS
Alleluia ọ biliwo, ọ biliwo Jesu a.
Kpọghara n'elu be Onye nmeri, Alleluia ọ biliwo.
Ọ biliwo, ọ biliwo Jesu a,
Kpọghara n'elu be Onye nmeri.
VERSE 1
N'ụtụtụ ka ụmụ nwanyị
Jere n'ili ite ude n'ahụ Jesu.
Mmụọma si n'igwe gbadata n'ili
Wee sị ha na ọ biliwo.
VERSE 2
Mary n'ebe akwa n'azụ chọ ahụ Jesu,
Mary n'eti mkpu n'ili Jesu.
Mary n'akwọgharị ebe n'ili Jesu,
Mgbe o zutere Dinwenu.
VERSE 3
Mary emetụkwanam aka
N'ihi na akarom wee rịgoro n'igwe.
Gabazia ga gwa ụmụ azụ m
Ka ha gaba na Galilee,
Ebe ahụ ka m g'anọ gosi n'onwe m n'ụwa.
VERSE 4
Alleluia Onye nmeri ebiliwo,
Kristi Onye nmeri ebiliwo.
Tobenu Chineke, Ọ bụ Dike n'agha,
Dike nadụ mkpa.
Odogwu akataaka, O meriri ọnwụ.
Kwansụ meriri ọnwụ.
Mary ahụgo ya,
Peter ahụgo ya,
Ndi mmụọ ozi n'ekwe,
Ndi ụmụ azụ ahụgo ya.