Full Lyrics
[REFRAIN]
Alleluia, Onye mmeri emeriwo,
Alleluia, ike ọnwụ adawo mba.
Onye mmeri emeriwo,
Messiah ebiniwo.
[VERSE 1]
Alleluia, Ọkpara Chineke emeriwo,
Jesu emerigo, leenu ike ọnwụ adawo n'ala,
Jesu emeriwo ike ọnwụ.
[VERSE 2]
Alleluia, Jesu Kristi achịbawo,
Ndị naag'ije n'ọchịchịrị gaahụ ihe ọzọ,
Jesu emeriwo ike ọnwụ.
[VERSE 3]
Alleluia, Onye nzọpụta ụwa emeriwo,
Etu o si kwuo k'o siri mee n'ụbọchị nke atọ,
Jesu emeriwo ike ọnwụ.
[VERSE 4]
Alleluia, Jesu Kristi emeriwo,
Ákwà mgbochi ekewala,
Mmehie magwụla maka na
Jesu emeriwo ike ọnwụ.