Jesu Nwa Chineke Abiago by Alloy Zurigbo — Lyrics

Alloy Zurigbo Igbo Christmas Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ka ugwu nile na ndịda nye Chineke ekele; ka mba nile dị n'ụwa bịa jaa Ya mma. Bịa jaa Ya mma n'Omer'anyị ihe dị mma; Jesu Nwa Chineke abịago, k'anyị ṅụrịba. VERSE 1 Mba nile tiberenụ Chineke egwu, Ony'obi ebere Ya dị mgbe nile. VERSE 2 Udo Chineke abịago n'ụwa; Amara Ya abatago; amara nke Chineke, k'anyị gaa naranụ ya. VERSE 3 Ozi siri n'igwe bịa, ka ndị M'ozi n'ekwu Otito dịrị Chineke n'elu; n'ụwa, udo. VERSE 4 Lekenenụ ka Chukwu Nwa siri n'igwe bịa n'ụwa wer'ọnọdụ. VERSE 5 Jesu Kristi Nwa Ọhụrụ nke Bethlehem, anyị n'asị Gị daalụ. Ihe I merel'anyị erika. VERSE 6 Otito dịrị Nna, Otito dịrị Nwa, Otito dịrị Mmụọ Nsọ n'ụwa ebebe. Amen.

Download the sheet music

Jesu Nwa Chineke Abiago

Jesu Nwa Chineke Abiago

By Alloy Zurigbo
Solfa
Igbo
1 page
3 Downloads
Christmas Hymns
0 0

More lyrics you may want