Full Lyrics
CHORUS
Jesu nọ n'oriri nsọ, bia were ndụ n'ime m, site na Chicha na mmanya a gọziri n'ọlta.
Jesu nọ n'oriri nsọ, ị hụrụ mu n'anya ma n'ị dị masị m a. Biko Nwa atụrụ, bata n'ime mu k'anyị biri.
Anam arịọ gị biko bata. Anam arịọ gị gbaghara na ifer'onwe mu n'emezi mu mak'if'omume njọ m o.
Anam arịọ gị biko Nna m o, Anam arịọ gị bia were ọnọdụ n'ime m, site n'aChicha na mmanya a gọziri n'ọlta.
VERSE 1
Ọ kwa Jesu nke Mary mụrụ mmadụ a gị kpọgburu n'obe?
Ọ kwa ọ nabatara ọnwụ ahụ o nweghị fụ maka njọ anyị?
Ọ kwa ahụ n'ọbara ya bụ a chicha na mmanya, nri mkpụrụ obi?
Ekwesịrị m k'ị bata n'ime mu ma na ofu okwu gị gaazọbi m o biko...
VERSE 2
Ọ kwa kwa mgbe kwa mgbe a n'adapụ n'okwukwe.
Ọ kwa kwa mgbe kwa mgbe a n'arịa ma n'emehie.
Ọ kwa kwa mgbe kwa mgbe a n'arịọ gị mgbaghara.
Ọ kwa kwa mgbe kwa mgbe m n'achọ nanị njọ.
Ọ kwa ahụ n'ọbara ya bụ a chicha na mmanya, nri mkpụrụ obi.
Ekwesịrị m k'ị bata n'ime mu ma na ofu okwu gị gaazọbi m o biko biko...
VERSE 3
Amaram n'emejọrọ m gị.
Amaram n'echefugọ m gị.
Amaram na mara m ụma mee njọ ụgbọ ụgbọrọ, ihi ji maka ya nwụọ...
Mana achọrọ m ịlaghachi na ya.
Achọrọ m ị n'agbawa gị obi, gbaghara mu o gbaghara nwa n'arịọ gị.
Ọ kwa ahụ n'ọbara ya bụ a chicha na mmanya, nri mkpụrụ obi.
Ekwesịrị m k'ị bata n'ime mu ma na ofu okwu gị gaazọbi m o biko biko...