Full Lyrics
CHORUS
Jesu ebiliwo n'ọnwụ, n'ezia.
K'anyị nweb'añụrị.
Alleluia!
Kristi emerig'ọnwụ.
VERSE 1
N'ụzụtụtụ, ha jere n'ili
ị te ude n'ahụ Jesu.
Mmụọma siri n'igwe gbadata
sị ha na Kristi ebiliwo.
VERSE 2
N'ụbọchị nke atọ, O bilitere n'ọnwụ.
Ụbọchị nke atọ, Jesu bilitere n'ọnwụ eh!
Golibe nụ na Kristi emerig'ọnwụ.
O biliwo! O merigo.
VERSE 3
Alleluia! na Kristi emerig'ọnwụ.
Ọnwụ enweghị ike n'eb'Ọ nọ.
Jesu ebiliwo n'ọnwụ.
Dinwenụm bilitere n'ọnwụ.
Alleluia! Kristi emerig'ọnwụ.