Full Lyrics
[REFRAIN]
Jesu chekwaba mkpurụ obi m o
Chekwaba m kpurụ obi m n'ụlọ Gị doo
Ị gaghị ekwe ka mkpurụ obi m o re ure
N'ala ndị mmụọ
[VERSE 1]
Mkpurụ obi m kere n'oyiyi Gị Jesu
Mkpurụ obi m kere n'ọdịanwụghịanwụ
K'ọ tọgbọrọ leenu k'ọ guzoro Jesu
Ọ gaghị ere n'ala ure n'ili ọnwụ
[VERSE 2]
Chukwu ahapụghị nwa Ya
K'ọ re ure n'ili
Chukwu ahapụghị nwa Ya
Ka ọ laa n'iyi
Chukwu meriri ili
Merie ọnwụ merie mmehie
Chekwaba obi m o n'ebe nsọ Gị
[VERSE 3]
Mgbe Ị g'akpọ ndị kwere ekwe
N'ụda opi ike nk'igwe
Mgbe Ị g'akpọ ha n'ọgbakọ ndị mmụọ ozi
Cheta m oh Jesu
Cheta m u o cheta m u
Abụ m onye kwere
[VERSE 4]
Onye iro biara izuru
Onye iro biara ka o gbue
Ka o bibisia ụmụ nke Chukwu
Chi m o ekwela
Chukwu ekwela
Ka onye iro mkpurụ obi metụ m aka